Skip to content

AMBODE EZIGARALA SANWO-OLU OZI EKELE MA KWE NKWA IKWADO YA NA NTULIAKA A GA-EME N’AFỌ ỌZỌ

N’ikpeazụ, aka na-achị steeti Legọs bụ Akinwunmi Ambode ezigarala Sanwo-Olu ozi okele maka mmeri ya na ntuliaka onye ọgaara emere na steeti ahụ n’ụbọchị Tụzdee.

Ambode kwuru nke a n’ozi ọgbasaara mba ụwa n’ehihe taa. Ambode kelere ndị òtù pati APC nakwa ndị Legọs niile ma kwe nkwa nkwado ya iji mee ka Legọs gaa n’ihụ.

GUKWUO: SANWO-OLU EKELELA TINUBU, OSHIOMHOLE MAKA NKWADO HA NA MMERI O NWETARA N’ỤBỌCHị TỤZDEE

Jide Sanwo-Olu bụ onye bụbụrụ kọmishịọna na steeti Legọs meriri Ambode iji bụrụ onye ga-eji aha pati APC dọọ ọkwa gọvanọ n’afọ n’abịa abịa.

Aka chịbụrụ steeti ahụ n’oge gara aga bụ Bola Tinubu na ndị ǹdú APC ama ama na steeti ahụ kwadoro Sanwo-Olu maka ọkwa gọvanọ nke steeti ahụ.

Ambode kelere ndị Legọs maka ikwenye na ya ma rịọ ha ka ha nyere pati APC aka dịka ha na-akwado maka ntuliaka elu n’afọ ọzọ.