Skip to content

Ala Nigeria Anabatala Ndị ọrụ Ubi Si Mba Russian

Osote onye isi ala bụ Yemi Osinbajo, ekuola n’Ọ ka mma ịkwado ọrụ ubi n’ime obodo karịa ịtụbata ngwa ahịa nke agaghị enye aka na mgbanwe ego.

Osinbajo mere ka A mata nke a mgbe Ọ nabatara ndị mba Rọshịa dunyere, nke onye ndu ha bụ onye minista ọrụ ugbo mba Rọshịa, Maazị Alexander Tkachev, bụkwa onye isi oche nke otu kọmishọn jikọrọ Naịjirịa na Rọshịa.

Ọka mmụta Osinbajo kwuru sị na

Ọnụ ahịa mmanụ agbatuola nke ukwu, ma A kana agbanwekwa ukwutukwu ego maka ịzụta nri na mba ofesi, ma anyị nwere ọtụtụ ala dị mma maka ọrụ ubi. Nke a enweghị uru ọ bara ma ọ buru n’anyị anaghị akọ ịhe n’ala ndị a.

Osote onye isi ala gwara ndị ọrụ ụbi ahụ si mba Rọshịa ka ha bịa malite ọrụ ụbi n’ala Naịjirịa,were na-akọpụta ma na-ebupukwa ịhe ha wepụtara.