Skip to content

ANYị ACHỌGHị IBULI ỤGWỌ AKWỤKWỌ NDị NỌ NA MAHADUM – ỌCHịCHị ETITI

Ministri na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’ogo etiti n’ala anƴị nọrọ n’ụbọchị Wenezde kwuo na enweghị mgbe ha nwere atụmatụ ibuli ego ụmụ akwụkwọ nọ na mahadum n’ala anyị na-akwụ dịka òtù na-ahụ maka ndị nkụzi mahadum n’ala anyị bụ ‘Academic Staff Union of Universities’ (ASUU) si kwuo.

GUKWUO: UKACHUKWU EMERIELA BIANCA OJUKWU NA NTULUAKA ONYE ỌGAARA NKE APGA MERE

Ọ bụ onye odeakwụkwọ ụkwụ òtù ministri a bụ Maazị Sonny Echono kwuru nke a n’Abuja mgbe ọ na-agọnarị ebubo ahụ ndị òtù ASUU boro ha. Ọ gara n’ihu kwuo n’ọchịchị etiti na-achọ imepegharị ụlọakụ maka agụmakwụkwọ n’ala anyị. Nke a bụ iji nyere ụmụakwụkwọ aka ibinye ha ego nakwa inye ha ihe ndị ọzọ maka agụmakwụkwọ ha.

Echono bụ onye kwuru okwu n’ụbọchị ndị nkụzi akpọrọ ‘World Teacher’s Day Symposium’ mere ka amata na onye nkụzi ọ bụla n’etozughị oke ka a ga-achụpụ tupu ruo afọ 2020.