Skip to content

AKA MGBA NDI CHEERE AMBODE DIKA APC GA-EME NTỤLIAKA ONYE ỌGAARA NA SATỌDEE

Aka na-achị steeti Legọs bụ Akinwunmi Ambode nwere aka mgba chere ya n’ịhụ n’ụbọchị Satọdee  dịka otu pati APC ga-eme ntuliaka onye ọgaara.

GUKWUO: POGBA GA-AHAPỤRIRI MANCHESTER UNITED NA JENUARị – INCE

Ambode bụ onye ahọputara n’afọ 2015 ịnọchị anya Babatunde Fashola. Ọ na-achọ ịlọghachị dịka aka na-achi steeti Legọs nke ugboro abụọ.

Mana aka mgba o nwere ụgbụ a bụ na enwelaa mmadụ abụọ ndị ọzọ ya na ha ga-achịpu ya n’ụbọchị Satọdee.

Aka mgba a cheere Ambode n’ihu bụ n’ihi nsogbu ya na otu onye ndụ APC na steeti Legọs bụ Ahmed Tinubu nwere. Tinubu bụ onye ndụ ama ama n’ekwu ihe na-eme n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na steeti Legọs.