Skip to content

NDị AGHA ỤGBỌELU ALA ANYị AKPỌKALA ỤGBỌELU HA ABỤỌ N’ABUJA

Ndị agha ụgbọelu ala anyị (Air Force) ekwuola na ụgbọelu ha abụọ kpọkara n’ụbọchị Frịdee na Mpape nke dị n’Abuja.

Ihe mgberede a mere mgbe ha na-akwado maka mmemme ncheta nweere onwe ala anyị nweere onwe ha site n’aka ndị ọcha bụka nke a ga-eme n’abalị mbụ nke ọnwa ịrị  n’afọ a.

GUKWUO: NUPENG ESONYELA NLC NA NFANYEAKA N’Ụ́kWỤ́

Onye na-ekwuchitere  ndị agha ala anyị ọnụ bụ Commodore Ibikunle Daramola kwụrụ na-enweghị onye tufurụ ndụ ya n’ihe mgberede ahụ.

Daramola gara n’ihụ kwuo na ụgbọelu ha ga na-efegharị gburugburu ịsị ọchịchị ala anyị bụ Abụja site taa rụo abalị abụọ nke ọnwa ịrị dịka ha na-akwado maka mmemme a.

Daramola kwụkwara na ụgbọelu ha agaghị efesi ike mgbe ha ga na-eme nkwado a.