Skip to content

AGBAGHARALA M GI – OBASANJO GWARA ATIKU

Onyeisiala n’oge gara aga bụ Olusegun Obasanjo nọrọ n’ụbọchị taa kwuo na ya agbagharala onye buburu osote ya  bụ Atiku Abubakar. Obasanjo kwuru nke a n’ọba akwụkwọ ya dị n’Abeokuta mgbe ya na Atiku nwere nzukọ.

O jiri ohere ahụ keele Atiku maka inweta mmeri na ntuliaka ime ụlọ nke òtù PDP mere n’ịzu ụka gara aga.

Obasanjo kwuru sị “ụzọ ọ bụla ijirila mejọọ m, dịka onye n’eme njọ ụbọchị niile ma  n’arịọ Chineke mgbaghara, agbagharala m gị, ma mụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga ma mekwaa ihe dị mma”.

Ndị ọzọ so bịa na nzụkọ a bụ Bishop Oyedepo, Sheik Gumi, Bishop Kuka, Uche Secondus nakwa ndị ndụ Yoruba ndi ọzọ. Mmezi a bụ maka ntuliaka elu a ga-eme n’afọ ọzọ.