Skip to content

AFENIFERE AKWỤSILA OMISORE N’ÒTÙ HA MAKA INYE APC NKWADO

Òtù ndị Yoruba akpọrọ Afenifere nọrọ n’ụbọchị Tụzdee machie onye jịrị aha pati ‘Social Democratic Party” (SDP) dọo ọkwa gọvanọ na steeti Osun bụ Iyiola Omisore otu afọ maka ịdọnyere nakwa inye APC nkwado na ntuliaka maka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ.

Ha na-ebubo Omisore ebubo maka inye APC nkwado na mmegharị ntuliaka emere na okpuru ochịchị Ife South na North bụkwa nke mere APC ji nweta mmeri.

Ha kwuru na o nụpụrụ pati ya nakwa Afenifere isi.

Afenifere nwere mkpebi a n’ụbọchị Tụzdee mgbe ha mechara nzụkọ kwa ọnwa ha mere n’ụlọ onyeisi ha bụ Chief Reuben Fasoranti.

Ndị òtù a kpebiri na ha agaghị enye APC nkwado na ntuliaka ahụ e mere na steeti Osun nkawa na ntuliaka elu a ga-eme n’afọ 2019.

Mmachị a ha machịrị Omisore ga-anọ ruọ otu afọ.