Skip to content

ADELEKE LERE ULE MAY/JUNE NKE AFỌ 1981 – WAEC

Obi ga-abụ onye na-adọ ọkwa gọvanọ na steeti Osun n’otu patị PDP bụ Sen. Ademola Adeleke sọ ọchị dịka  ‘West African Examination Council (WAEC) kwuru na o lere ule May/June n’afọ 1981.

WAEC mere nke a site n’iwu ụlọikpe dị n’isiala anyị bụ Abuja nyere ya ka o weputa okwe ule Adeleke.

GUKWUO: AMERIKA GA-ANABATA MMADỤ DỊ PỤKỤ NARI ỊRỊ ATỌ NA PỤKỤ ỊRỊ GBARA ỌSỌ NDỤ N’OBODO AHỤ N’AFỌ 2019

Site n’akwụkwọ nke osote onyeisi odeakwụkwọ nke WAEC gbasara ule ụlọ akwụkwọ bụ Henry Sunday Adewunmi Osindeinde, kwuru na Adeleke lere ule May/June nke afọ 1981 n’ụlọakwụkwọ Ede Muslim High School, nke dị na Yidi, Ede. Akara ebe ọ nọ lee ule bụ: 19645, n’ebe akara ule ya bụ 149.