Ọ bụ nnọọ ụwa bịa kirie, dịka ụmụafọ, ndi enyi, ndị nwadiala, ikwu na ibe nakwa ndị agbataobi obodo Adazi-Nnukwu nuputara n’igwe ma sonye na mmemme iri ji ọhụụ nke ya bụ obodo, nke ahọ 2017.
Ya bụ mmemme weere ọnọdụ n’ahịa Afọr Adazi-Nnukwu dị n’okpuru ọchịchị Anaocha na steeti Anambra ụbọchị Satọdee gara aga, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ, ma ndi nọ n’ụlọ na ndị bị na mba ofesi, tinyere ọtụtụ ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti.
Ka ọ na-eme mmemme ịwa ji, Adama (eze ọdịnala) Adazi-Nnukwu, bụ Igwe Ọkammụta Augustine Obiekezie kwuru na ya bụ mmemme abụrụna nnọ oge ịgbakọ kpee ekpere, kelee Chineke maka ngọzị ya na obodo ahụ, ma kwanyekwara ụmụafọ obodo ahụ ugwu.
Ọ kọwara ji dịka eze nke ihe niile a kụrụ n’ubi, ma kpọkwazie oku ka e webata ụzọ ọgbara ọhụụ e ji akọ ụgbo, iji wee kwalite ihe omume ya na ihe a na-enweta site na ya.
NDỊ IGBO BI NA REGINA, KANADA, EMENA MMEMME “UBOCHỊ NDỊ IGBO” NKE AFỌ 2017
N’okwu nke ya na mmemme ahụ, onye kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịaa, ọrụ aka na nkwalite egwuregwu, bụ Dọkịnta oriakụ Uju Nwọgụ kọwara mmemme iri ji dịka ụzọ pụrụ iche e si egosi ma na-akụnye n’ime ụmụntakịrị Igbo omenala ndi Igbo na ịma mma nke ọnatarachi dị iche iche Chineke jiri wee gọzie ndị ya bụ agbụrụ.
Ọ kpọkuru onye ọbụla, ọ kachasị ndi ntorobịa ka ha banye n’ọrụ ugbo ma jikọtakwa onwe ha ọnụ n’otu ‘cooperative’ dị iche iche iji wee rita uru n’atụmatụ dị iche iche gọọmenti steeti ahụ ji n’aka banyere ngalaba ahụ iji kwalite ọdịmma nke ndị bi n’ime ime obodo.
N’aka nke ya, onoowu nke obodo Adazi-Nnukwu, bụ maazị Emmanuel Ugwumba, onye kpere ekpere maka udo na ọganihu nke obodo ahụ, kpọkukwara ndi ntorobịa obodo ahụ ka ha jikọta onwe ha ma sonye n’ihe dị iche iche gọọmenti steeti ahụ na-eme, ọbụnadị site n’inye Gọvanọ Willie Obianọ nkwado maka ịchị nke ugboro abụọ n’ihi ihe dị iche iche o megooro ndị obodo ahụ.
UNESCO Akwanyerena Onye Na Eti Egwu Na Ala Aanyi Ugwu, Site N’Inye Ya Ihe Nrite
Onye ‘Pesident-General’ nke obodo ahụ, bụ maazị Francis Madubuike nakwa onye isi otu ‘Society of Engineers’ n’oge mbụ, bụ maazị Chief Cyril Anaeto, kwuru n’otu n’otu, na udo tọrọ atọ na ezi nchekwa dị n’obodo ahụ ugbu a bụ n’ihi ịdị uchu nke ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ, ma sịkwazie na ọ bụ ezi mgbanwe nke ọchịchị ya wetagoro na ngalaba ọrụ ugbo mere e jiri nwee nnukwu owuwe ihe ubi na ya bụ obodo n’ahọ a.
A nọrọ na mmemme ahụ wee gbaa egwu uhie na egwu ọdịnala ndị ọzọ dị iche iche, ma gosikwa ọnatarachi dị iche iche ndi Igbo nwere.
Ihe pụtakarịchara ihe na ya bụ mmemme bụ ịwa ji, bụ nke Igwe Augustine Obiekezie mere, nakwa ikesa ji ahụrụ ahụ, bụ nke e ji mmanụ nrị, ụkpaka, ose na akwụkwọ ụtazị wee chọọ mma, nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.