Skip to content

NDị NA-ACHI EHI EGBUOLA MMADỤ ịRị NA ITOLỤ NA PLATEAU STEETI

Ndị na-achị ehi a na-akpọ ‘Herdsmen’ nọrọ n’abalị Wednezdee gbuo mmadụ ịrị na itolụ na steeti Plateau. Ebe ha kpara arụ a bụ n’obodo a na-akpọ Ariri bụkwa nke nọ n’okpuru ọchịchị Bassa.

Ndị a na-achị ehi wakporo obodo ahụ n’abalị Wednezde ma gbagbuo ndị mmadụ dịka ha na-arahụ ụra.

Otu onye n’ime ndị bị n’obodo ahụ kwuru na ndị nche abịabela ebe a ihe a mere dịka ozu ndị mmadụ nọ n’ebe niile.