Skip to content

ABUBU ORU NKE NDI OTU ASUU

Okwu n’eso isiokwu: Kwubie ihe mberede gbata oso n’aguma-akwukwo! Oluremi n’ario govumenti etiti.

Gere akuko a n’uju: Onye ome iwu (senator) Oluremi Tinubu n’izu uka a kporo ka enwe ihe mberede gbata oso (state of emergency) n’ngalaba aguma-akwukwo nke obodo Nigeria.

Onye ome iwu a kwuru ihea n’obodo Lagos mgbe ona-arutu aka n’ihe gbasara abubu oru akwusi-akwusi ndi otu ana-akpo Academic Staff Union of Universities (ASUU) bidoro n’obodo niile di na Nigeria.

Onye nta akuko anyi bu De Baptist mere ka anyi mara na Oluremi Tinubu okwuru si n’okwesiri ka ewe gbata-gbata bia nyere m aka n’ngalaba aguma-akwukwo nke obodo Nigeria, Oluremi gwara ndi nta akuko n’ogbako nke ndi Mahadum Lagos mere, nke akporo 12th Annual Research Conference and Fair, nke bu atugharia ya n’igbo oburu (Ogbako nke nchoputa n’enyema-aka agba nke iri n’abuo nke ana ehiwe kwa afo).

asuu-Universities-Nigeria-Nigerian-strike-ABUBU

Okwuru si tupu atuo atumatu ka aga esi kerie ego diri ndi nke ana-akpo (Budget) ekwesiri imata n’aguma-akwukwo di mkpa nke ukwuu, mana n’ngalaba aguma -akwukwo mahadum bu ihe eledera anya.

Oluremi Tinubu kwuru si mgbe oletara mahadum di iche iche ohuru n’ulo ebe ana-amu ihe nka n’uzu bu ihe adighi ka okwesiri idi, ya na ebe ndi ozo ana-akuzi ihe.

Ona ario ndi govumenti etiti ka ha leba anya n’ihe gbasara ASUU n’ebe odi ukwuu tupu ihe emebie, ma gbaa mbo ka abubu orua kwusi.

Oluremi n’ario ndi otu ASUU ka ha gosi nghota n’amam ihe n’ebe ndi govumenti etiti (Federal) no, ma nyere umu akwukwo aka ka ha nogide n’aguma-akukwo ha. Osikwa ndi ASUSU biko tachie nu obi kwusi abubu oru.

Soyere m n’ngalaba oha na @isimbidotv