Skip to content

Abali 29 Nke Ọnwa Mee Bu Ụbochi Ezum-Ike Ọchichi Onye Kwuo Uche Ya

democracy-ochichi-abali-isimbido-tv

ABALỊ 29 NKE ỌNWA MEE BỤ ỤBỌCHỊ EZUM-IKE OCHICHI ONYE KWUO UCHE YA

Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ochichi onye kwuo uche ya.

Ozi anyị nwetere site n’aka ngalaba mgbasa ozi n’asụsụ Igbo nke ụlọ ọrụ Voice of Nigeria kwuru n’onye Mịnịsta na-ahụ maka ịhe na eme n’ala Naịjirịa bụ Adulrahman Bello Dambazau, onye lagoro ezum-ike nka dịka Lieutenant General, kelere ndị Naịjirịa maka emume a.

O kwuru na mmemme a A na-eme n’ubochị taa na-egosikwa na ọchịchị onye-isi ala bụ Muhammadu Buhari agbala afọ abụọ.

Adulrahman Bello Dambazau kwekwara ndị Naịjirịa nkwa n’ọchịchị dị ugbu a ga-agba mbọ ịhụ na E meziri ọnọdụ akụ n’ụba ala Naịjirịa.

Mịnịsta Dambazau kwuru na gọọmenti na-agba mbọ maka ịkwalite ọnọdụ ezi nchekwa site n’ibu agha megide mpụ. Ọ kpọkuru ndị Naịjirịa ka ha kwado gọọmenti n’ime ka ọchichi onye kwuo uche ya nọgide.