Skip to content

ỤGWỌ ỌNWA OPEKATA MPE: NNAMDI KANU AGWALA NDI ỌRỤ KA HA HAPỤ ISONYE NA NTULIAKA ELU NKE AFỌ 2019

Onyeisi  òtù ‘Indigenous People of Biafra’ (IPOB), bụ maazị Nnamdị Kanu agwala ndị ọrụ nọ n’ala anyị ka ha sonye ndị IPOB site n’ihapụ isonye na ntuliaka elu nke a ga-eme n’afọ 2019.

Kanu kwụrụ nke a n’ụbọchị Sọnde mgbe ọ na-ezigara mba ụwa ozi site n’obodo Israel. Ọ gwara ha ka ha kwụdosie ike ma hapu isonye na ntuliaka elu nke afọ ọzọ.

GUKWUO: ASUU EBIDOLA NFANYEAKA N’ỤKWỤ

Ọ gakwara n’ihu gwa ndị ọrụ na ọchịchị etiti ga-emejuputa ihe ha chọro ma ọ bụrụ na ha ajụ isonye na ntuliaka ahụ.

Ọ rịọrọ òtù jikorọ ndị ọrụ dị iche iche n’ala anyị ka ha sonyere IPOB na n’ịgbasa ozi megide isonye na ntuliaka elu nke afọ 2019.

O kwụkwara na-enweghị ihe ọ bụla ga-ekewa IPOB.