Skip to content

FAYOSE NWERE IKE IHAPỤ PDP

Aka na-achị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose ekwuola na ya nwere ike Ịhapụ PDP.

N’ozi ya n’ụbọchị Mọnde, Fayose kwuru na owuteghị ya na ya kwadoro Aminu Tambuwal imeri na ntụliaka onye ọgaara nke òtù pati PDP mere n’izu ụka gara aga.

GUKWUO: ỌCHịCHị ETITI GA-EWEPUTA ỤGWỌ ỌNWA ỌHỤRỤ N’OGE N’ADịGHị ANYA – AYUBA

Atiku Abubakar meriri Tambuwal iji nweta mmeri.

Fayose gara n’ihu kwuo na owuteghị ya na ya na gọvanọ na-achị steeti Rivers bụ Nyesome Wike kwadoro Tambuwal ka o merie.

Fayose kwuru si “ E nwere m ike ihapu PDP, ma ka ọ dị ụgbụ a, mụ na ndị ọzọ ga-ele ka ihe ga-esi gaa”.