Ndị agha ụgbọelu ala anyị (Air Force) ekwuola na ụgbọelu ha abụọ kpọkara n’ụbọchị Frịdee na Mpape nke dị n’Abuja.
Ihe mgberede a mere mgbe ha na-akwado maka mmemme ncheta nweere onwe ala anyị nweere onwe ha site n’aka ndị ọcha bụka nke a ga-eme n’abalị mbụ nke ọnwa ịrị n’afọ a.
GUKWUO: NUPENG ESONYELA NLC NA NFANYEAKA N’Ụ́kWỤ́
Onye na-ekwuchitere ndị agha ala anyị ọnụ bụ Commodore Ibikunle Daramola kwụrụ na-enweghị onye tufurụ ndụ ya n’ihe mgberede ahụ.
Daramola gara n’ihụ kwuo na ụgbọelu ha ga na-efegharị gburugburu ịsị ọchịchị ala anyị bụ Abụja site taa rụo abalị abụọ nke ọnwa ịrị dịka ha na-akwado maka mmemme a.
Daramola kwụkwara na ụgbọelu ha agaghị efesi ike mgbe ha ga na-eme nkwado a.