Skip to content

EKERESIMESI: ỌCHICHI ETITI CHỌRỌ IBELATA ỌNỤ AHỊA OSIKAPA

Dịka ekeresimesi na-abịa nso, ọchịchị etiti na-echa ka ọ ga-esi belata ọnụ ahịa osikapa.

Ọ bụ onye minista na-ahụ maka Orụgbo nakwa mmepe ime ime obodo bụ Audu Ogbe kwuru nke a n’ụbọchị Tọzdee mgbe ndị isịoche otu ‘Rice Farmers Association of Nigeria’ (RIFAN)  na-ahụ maka imeputa osikapa bịara ya njem mbịarụ n’Abuja.

GUKWUO: OTU NWA AKWỤKWỌ AKWỤOLA ỤDỌ NA STEETI ANAMBRA

Iji mejupụta nke a, Ogbe kwuru ya na ndị isioche otu a (RIFAN) nakwa ndị ọzọ ọnụ ha na-eru n’okwu n’ihe gbasara imeputa osikapa ga-enwe nzụkọ n’ịzụụka abụọ na’abịanụ.

Ogbe kwuru na mgbe ha ga-emecha nzụkọ a, ha ga-eweputa ukpuru ga-enyere ha aka ibelata oke ọnụ ahịa osikapa n’oge ekeresimesi.

Gabsara ide mmịrị, Ogbe kwuru na ochịchị etiti ga-eweputa udi osikapa dị iche iche bụkwa ndị nke ide mmịrị na-apụghị inye nsogbu.