Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari agwala onyeisi ndị uweojii n’ala anyị bụ Ibrahim Idris, ka ọhapu Sen. Ademola Adeleke tutu ruo mgbe e mechara ntuliaka elu maka onye ga-abụ gọvanọ na steeti Osun.
GUKWUO: URU IṄỤ MMỊRỊ BARA NA NDỤ MMADỤ
E nwere onye gara ndị ntọakụkọ nke a n’ụbọchị Wenezdee nke ịzuuka a.
A ga-echeta na ndị uweojii kpọrọ Adeleke oku n’isi ọchịchị ala anyị dị n’Abuja gbasara ebubo nrụrụ aka n’ule nakwa ihe ndị ọzọ.
Adeleke ga-anọ n’ụbọchị Satọdee ịzụuka a chịpụ ya maka onye ga bụ gọvanọ steeti Osun n’otu pati PDP, ya na Gboyega Oyetola nke ‘All Progressives Congress’ (APC), Moshood Adeoti nke ‘Action Democratic Party’ (ADP); Iyiola Omisore nke ‘Social Democratic Party’ (SDP), Fatai Akinbade nke ‘African Democratic Congress’ (ADC).