Nwaada ala anyị ama ama n’ihe gbasara ide akwụkwọ n’ụwa nịịle bụ Chimamanda Adichie ka akwanyere ụgwu site n’ihe nrite nke Everett M. Rogers nke afọ 2019.
GUKWUO: URU IṄỤ MMỊRỊ BARA NA NDỤ MMADỤ
Ihe nrite a bụ nke a na-enye kwa afọ iji kwanyere otu onye ọkammụta laarala mụo ugwu bụ Everett M. Rogers .
Ihe nrite a bụ maka iji kwanyere Chimamanda ugwu n’ihi mbọ ya n’ebe ihe gbasara oke rụrụ ụmụ nwaanyị nakwa abụrụ. A ga-enye ya ihe nrite a n’ọnwa abụọ nke afọ 2019.