MMADU ABUO N’AMAGHI ORU WARA NWANYI AFO
Mmadu abuo ana enyo-enyo dika ndi n’amaghi oru- Adetoun na Dada emela aru!
Gere akuko a na uju: Otuo a ka osiri mee, Adetoun Oyebade bu onye n’ahu maka ahu ike nke mmadu anakpo (nurse) ya na Moses Dada bu onye n’enyere ndi dokinta aka n’ulo ogwu.
Mmadu abuo a awala otu nwanyi afo, onye nke si n’afo n’egbu ya ngbu, akpurula mmadu abuo ndia gaa ulo ikpe nke ama dika Ikeja Chief Magistrate’s Court, Lagos.
Ndia ana ebo ebubo, Oyebade onye gbara afo iri ano n’ato (43) onye nke bi na Fajumo street Alakuko, Lagos, onye nke ozo-Dada onye gbara afo iri ano n’otu (41) onye nke si Ifo di n’obodo Ogun, bu ndi ji eze ekpe ekwere ugbua n’ulo ikpe maka na ha enwere ulo ogwu nke govumenti enyenyi akara ike oru.
Nwanyi ahu nke awara afo bu onye nyere aha ya dika Mrs. Sherifat si na Oyebade lere ya ahu si na nwere Appendicitis ma gwa ya n’aga awa afo ka ewepu ya.
Oyebade kporo Dada ka ha jiko aka onu waa nwanyi ahu afo, mana mgbe ihe ka nte biakwutere nte onu (mgbe iwa afo ahu kariri ha) ha buru nwanyi ahu gaa n’ulo ogwu ozo.
Mana mmadu abuo a si na ikpe amaghi ha, nke a mere onye oka ikpe (chief magistrate) Taipei Akanni siri na ha ga akwu puku nari abuo (200,000) n’otu n’otu, ya na mmadu abuo ga ano n’aka ebe tupu atopu ha, onye oka ikpe gbuliri ikpe ahu n’ubochi iri abuo n’asato nke onwa asato (28th August 2017).
Nta akuko a n’abiara gi site n’ngalaba oba akuko n’isimbido tv.
Ichoro imata nke oma gaa n’isimbido.tv