Uzoma Asagwara enwetala mmeri dịka onye omeiwu na Canada

0
Uzoma Asagwara

 

Uzoma Asagwara

Otu nwaada ala anyị bụ Uzoma Asagwara, bụkwa onye bụ onye mba Canada enwetala mmeri dịka onye omeiwu na mba Canada n’òtù ndọrọndọrọ ọchịchị New Democratic Party. Mmeri o nwetara hiri odo n’ihi na ọ bụ nke mbụ ya ha ga ahọpụta onye isi ojii n’ọkwa ọchịchị na Manitoba.

Akụkọ kọrọ na Uzoma bụ onye nke atọ ahopụtarala dịka onye omeiwu na Manitoba  kamgbe afọ otu narị na iri ise Manitoba bidoro.

Uzoma kelere ndị niile nyerela ya nkwado tupu emee ntuliaka. Ọ bụghị naanị na nwaada a bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị doro anya kama, ọ bụkwa onye ma ihe banyere egwuregwu.

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here