Nnamdi Kanu, Murray-Bruce na Davido akatọla agha ebusoro ụmụ Naịjirịa

0

Tupu-O-nwa-mee-31-ho-ro-otu-n-okwukweMaazi Nnamdi Kanu, Sịnatọ Ben Murray-Bruce na Davido akatọla agha ahụ ndị Sọut Afrịka busoro ndị ala anyị bi n’obodo ha.

Maazi Nnamdi Kanu, onye ndu nke òtù ‘Indigenous People of Biafra (IPOB) akatọla agha ndị Sọut Afrịka busoro ndị Naịjirịa nọ n’obodo ahụ. O kwuru sị “Ọ bụ eziokwu na ma na-achọ ka ndị Biafra nwere onwe pụọ na Naịjirịa, mana a na m agbachịtere ndị nke a metutara ma na-achọkwa ka akwụsị ya ozugbo.

Otu onye sịnatọ n’oge agara aga bụ Ben Murray-Bruce n’aka nke ya kwuru na owutere ya n’ụdiri ihe onyonyo ndị ọ hụrụ banyere ihe mere na Sọut Afrịka. Ọ kọwara nke a dịka ihe dị nwute ma kwuo na ụmụafọ ala anyị ekwesighị udiri omume ahụ.

N’aka nke ya, nwaafọ ala anyị na-agụ egwu bụ David Adeleke bụ onye ama nke ọma dịka Davido kwuru na ọ bụrụ n’ala anyị bụ Naịjirịa dị mma, kedụ ihe ga-ebuga ndị ala anyị gaa Sọut Afrịka.

 

 

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here