NDI IGBO AGAGHI EKWE KA BUHARI NA APC GHỌRIA HA MAKA ỌKWA ONYEISIALA NKE AFỌ 2023 – ATIKU

0
Atiku Igbo

Atiku Abubakar, onye buburu osote onyeisiala n’oge gara aga nakwa onye ga-eji aha PDP dọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2019 ekwuola na onyeisiala bụ Muhammadu Buhari na APC agaghị emejuputa nkwa ha kwere ndị Igbo maka iweputa onyeisiala n’afọ 2023 ma ọ bụrụ na ha akwado Buhari na ntuliaka onyeisiala a ga-eme n’afọ ọzọ.

O kwuru na ọ doro anya na APC n’aghọrị ndị Igbo n’ihi na Buhari site n’ọnụ onye odeakwụkwọ ala anyị bụ Boss Mustapha kwụrụ na ọ bụ ndị Igbo ka ọkwa onyeisiala ga-agara n’afọ 2023, n’ebe onye minista n’ahụ maka ọkụ, ọrụ n’owuwu ụlọ bụ Babatunde Fashola kwuru na ọ bụ ndị Yoruba ka ọkwa onyeisiala ruru n’afọ 2023.

Atiku bụ onye kwuru nke a site n’ọnụ Segun Sowunmi bụ onye n’ekwuchitere òtù ọgbọ nta vootu ya ọnụ. Segun kwuru na Buhari n’APC egosila site n’afọ ndị gara aga na ha anaghị emejuputa nkwa ha kwere bụkwa nke ziputara n’ọtụtụ nkwa ha kwerela ndị ala anyị kamgbe 2105 bụkwa nke ha n’emejuputabeghị kamgbe afọ atọ n’ọkara ha weere ọchịchị.

 

TRANSLATION

Atiku Abubakar, former vice president and presidential candidate of the Peoples Democratic Party (PDP), has said President Muhammadu Buhari and the All Progressives Congress (APC) would not honour their pledge to make the South-East produce the president in 2023 if they support Buhari in next year’s presidential election.

He said it was clear that the APC was deceiving the Igbos because while the presidency, through the Secretary to the Government of the Federation (SGF), Boss Mustapha, was saying the presidency would be zoned to the South-East in 2023, Babatunde Fashola, Minister of Power, Works and Housing, said it was the turn of the South-West in 2023.

Atiku, who spoke through Segun Sowunmi, the spokesman of his campaign, said Buhari and his party had demonstrated over the years that they don’t keep their promises, which was evident in the myriad of promises they made to Nigerians during the 2015 campaign but were yet to fulfil them three and half years later.

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here