NGOLO KANTE ABIANYELA AKA N’AKWỤKWỌ INỌ NA CHELSEA AFỌ ISE ỌZỌ

0
NGolo-Kante

Nwa mba France ama ama n’egwuregwu bọọlụ, bụkwa onye na-agbara Chelsea bọọlụ bụ Ngolo Kante abịanyela aka n’akwụkwọ ịnọ na Chelsea afọ ise ọzọ.

Ọ bụ Chlesea kwụputara nke a n’igwe nrirịta ozi ọlọrọ ọhụrụ ha.

Aka a ọ bịanyere n’akwụkwọ ga-eme ka ọnọrọ na Chelsea ruo afọ 2023.

Kante, bụ onye gbara afọ ịrị abụọ na asaa soro France nweta iko mba ụwa n’egwuregwu bọọlụ bụkwa nke FIFA hazịrị na mba Russia n’afọ a.

Kante kwụrụ n’obi dị ya ụtọ ịnọkwụ na Chelsea.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here