REAL MADRID ACHỤỌLA LOPETEGUI N’ỌRỤ

0
julen lopetegui

Real Madrid nke Spain nọrọ n’ụbọchị Mọnde chụọ onye na-elekọta ọ̀tụ̀ egwu bọọlụ ha bụ Julen Lopetegui n’ọrụ dịka ọ n’erụghị ọnwa ise ha họpụtara ya ka ọnọchie anya Zinedine Zidane.

Ọ bụ Santiago Solaris ga-anọchị anya ya tụtụ ruo mgbe ha ga-ahọpụta onye ndụ ọzọ.

Ha chụrụ ya n’ọrụ ka o mechara otu abalị Barcelona menyere ha ihe ihere dịka ha ji ọkpụ goolu ise asatara naanị otu merie ha n’ụbọchị Sọnde izu ụka a n’El Clasico nke ha gbara.

Real Madrid kelere Lopetegui na ndị niile ya na ha so rụọ ọrụ, ma gọkwara ha ọfọ ọganiihu.

 

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here