AKPỌPỤLA OTU NWAANYị N’ỤLỌIKPE MAKA IRE AKWỤKWỌ AKỤKỌ NDị BIAFRA

0
MAMA BIAFRA

Akpọpụla otu nwaanyị aha ya bụ Felicia Ejezie bụkwa onye a na-akpọ ‘Mama Biafra’ n’ụlọikpe maka ire akwụkwọ akụkọ ndị Biafra.

Ọ bụ onyeisi ndị uweojii na steeti Abia bụ Ogbizi kpọpuru ya ụlọikpe na Fraịdee izu ụka gara aga maka ire akwụkwọ akụkọ ndị Biafra bụkwa nke iwu machịrị.

Ndị uweojii kwụrụ na ha nwụchịrị nwaanyị a gbara afọ ịrị ise na ise n’ebe ọ na-ere akwụkwọ akụkọ ndị Biafra dị iche iche bụkwa nke na-eme ka ndị òtù Biafra n’enweta ndị nkwado.

Nwaanyị a gọọrọ ọnụ ya na-enweghị ihe dị otu a ya mere.

Ndị ụlọikpe jụrụ ka anaa nwanyị a n’akaebe. Ha kwụrụ na nwaanyị a nwere ike ịgba ọsọ ma ọ bụrụ na ha anaa ya n’akaebe.

Ndị uweojii nwụchịrị ‘Mama Biafra’ na Wenezdee izu ụka gara aga n’Umuwaya ma kpọpụ ya ụlọikpe na Fraịdee.

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here