ỌCHỊCHỊ ETITI CHỌRỌ ịKWỤSI ỤMỤ NWAANYỊ IMỤ ỌTỤTỤ ỤMỤ

1
Zainab-Ahmed

Ọchịchị etiti ekwuola na ha nọ n’ọrụ ikwụsị ụmụ ole nwaanyị ọ bụla nọ n’ala anyị bụ Naịjirịa ga-amụ. Ha sị na nke a ga-enye aka ibelata ọnụọgụgụ ndị ala anyị bụkwa nke n’abawanye.

Ọchịchị etiti gara n’ihu kwuo na ha na ndị ndụ ọdịnaala nọ n’ala anyị na-arụkọ iji hụ na nke a bịara na mmezu.

Ọ bụ Minista na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru nke a n’Abuja mgbe ọ na-aza ajụjụ na ọgbakọ ‘Nigerian Economic Summit’ agba nke ịrị abụo na anọ ya e mere n’Abuja.

Zainab kwuru na ọnụọgụgụ ndị ala anyị bụkwa nke bụrụ ịbụ bụ otu n’ime nsogbu n’echere ala anyị aka mgba n’ihe gbasara akụnụba.

Zainab kwuru n’oge na-abịa mgbe a ga-eweta ụkpụrụ ga-egbochi nwaanyị ịmụ ọtụtụ ụmụ. O kwuru na nke a ga-eme ka akunụba ala anyị bawanye.

1 ikwu

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here