OSUN 2018: E JILA EKWE NTI MAOBỤ KAMERA ABỊA N’EBE A NA-EME NTULIAKA, KA INEC KWURU

Mahmood-Yakubu

OSUN 2018: E JILA EKWE NTI MAOBỤ KAMERA ABỊA N’EBE A NA-EME NTULIAKA, KA INEC KWURU

Otu na-ahụ maka ime ntụliaka elu n’ala anyị bụ INEC, enyela iwụ ka ndị niile ga-atụ vootu na steeti Osun ghara iji ekwe nti maobụ igwe e ji ese ihe osise bụ kamera abịa n’ogbe ebe  ntuliaka.

Ọ bụ onyeisioche otu a bụ Okammụta Mahmood Yakubu kwụrụ nke a na Mọnde n’Oshogbo na nzụkọ o nwere maka ntuliaka elu a ga-enwe na steeti ahụ na Satọdee izuụka a.

Gukwuo: OMISORE CHỌRỌ KA ỌCHỊCHỊ ETITI CHỌPỤTA NDỊ GBỤRỤ BOLA IGE

Ntuliaka elu ahụ bụ maka iji họpụta gọvanọ ga-achị steeti ahụ. Onyeisioche INEC kwuru na nke a ga-ebilata ire na izụ vootu bụkwa nke bụ ọlọrọ ọhụrụ nke ndị ndọrọndọrọ ọchịchị weputara.

Yakubu kwuru na a gaghị akwụsi ndị mmadụ ijide ekwe nti n’ogbe ebe a na-eme ntuliaka, kama a gaghị ekwe ha jide ekwenti ha ozugbo e nyere ha akwụkwọ ebe ha ga-abịanye aka.

1 ikwu

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here