Ndị gọvanọ sị ọwụwa anyanwụ amachiela iji ụkwụ achịbata ehi

south-east
south-east

Ndị gọvanọ si ọwụwa anyanwụ ala anyị (ala Igbo) amachiela ndị na-achị ehi iji ụkwụ ma site n’ime ọhịa achịbata ehi n’ala Igbo.

Ndị gọvanọ a kwuru nke a n’ozi ha zịpụrụ bụkwa nke onyeisi South-East Governor’s Forum bụ Ọkammụta Simon Ortuanya bịanyere aka na ya.

Ha kwuru na site ugbu a gawa n’ihu, ịchịbata ehi n’ala Igbo ga-abụ site n’iji ụgbọala bubata ha n’ahịa ebe ndị a ga-ere ha. Ha kwuru na isite n’ime ọhịa achịbata ehi bụ ya na-ebute ọgụ na mgba dị n’etiti ndị mmadụ na ndị na-achị ehi.

Ndị gọvanọ ndị a gakwara n’ihu kwuo na ha agaghị enye ala ha maka ihe ọ bụla gbasara RUGA. RUGA bụ ụkpụrụ ọchịchị etiti na-atụ inye ndị na-achị ehi ala ebe ha ga-anọ na-achị ehi na steeti niile dị n’ala anyị.

 

TRANSLATION

State governors in the South-East region has banned the movement of cows into the geo-political zone through the bush path by foot.

The governors stated this in a statement signed by the Director General, South-East Governors Forum, Prof. Simon Ortuanya.

They said henceforth, movement of cows into the zone should be done through the roads by using trucks in conveying the animals and offloading them to their specific cow markets.

“We will no longer allow foreign herdsmen to bring their cattle into our geopolitical zone through the bush paths by foot because this is what always cause conflict between our people and the herders,” the governors declared.

The governors restated their position that they have not and do not intend to donate lands for the creation of Ruga settlements.

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here