KAMGBE M HAPỤRỤ APC, A NA M AKWỤZI NDI ỌRỤ ỤGWỌ ỌNWA – ORTOM

samuel ortom

Aka na-achi steeti Benue bụ Samuel Ortom ekwuola na kamgbe ya hapụrụ APC banye na PDP, na ya na-akwụzi ndị ọrụ ụgwọ ọnwa.

Dịka Ortom sị kwuo, ndị ọjọọ nọ n’APC ekweghị ya nweere onwe ya.

O kwụrụ nke a mgbe ọ na-edu ndị Kọmishịọna mmadụ itolu n’iyi ọrụ n’isi ọchịchị steeti ahụ dị na Makurdi.

O kwụkwara na ndị ọjọọ jị steeti ahụ n’ọrụ akwụsila.

N’ okwu ya “Kamgbe m si n’APC banye na PDP, a bụzị m onye nweere onwe ya. A naghị m ejizi ndị ọrụ ụgwọ ọnwa. A na m akwụzị ụgwọ ọnwa n’ezi oge. Na APC, ndị ọjọọ agaghị ekwe gi mana ụgbụ a, a bụzị m onye nweere onwe ya”.

 

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here