ASUU EBIDOLA NFANYEAKA N’ỤKWỤ

ASUU-President-Professor-Biodun-Ogunyemi-1

Òtù jịkọrọ ndị nkụzi Mahadum n’ala anyị bụ ‘Academic Staff Union of Universities’ (ASUU) ebidola nfanyeaka n’ụkwụ n’ịhị na ọchịchị etiti emejuputaghị ihe ndị ha chọrọ.

Òtù a gara n’ihu kwuo na Mahadum ndị ọchịchị etiti nwe na nke steeti nwe ga-esonye na nfanyeaka n’ụkwụ a.

ASUU kwụrụ nke a mgbe ha nwechara nzụkọ n’abalị Sọnde na ‘Federal University of Technology’ nke dị n’Akure, steeti Ondo.

Mgbe onyeisi òtù a n’ala anyị bụ Prof Biodun Ogunyemi na-agwa ndị ntọ akụkọ okwu ka ha mechara nzụkọ ahụ, o kwụrụ na ha mere ihe niile iji mee ka ọchịchị etiti mejuputa ihe ha kwekọrịtara maka ha kpọchịrị nti.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọchịchị etiti enupula ịsị na nkwenye ha kwenyere n’afọ 2017 na 2009.

Ogunyemi boro ọchịchị etiti ebubo na ha achọghị itinye uche ha n’ebe mahadum gọmenti nwe nọ n’ihi na ụmụ ndị ọchịchị na ndị nwere ego na-aga na mahadum ndị nkịtị nwe.

 

1 ikwu

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here