A GA M ENWETA MMERI N’ỤLỌIKPE – ADELEKE

ADELEKE 2

Onye ji aha òtù pati PDP dọọ ọkwa gọvanọ na steeti Osun bụ Ademola Adeleke ekwuola na ya ga-enweta mmeri ya n’ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka.

Adeleke kwuru nke a mgbe ndị ntọ akụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ ozugbo okwe gbaara na mmegharị ntuliaka ahụ e mere na steeti Osun n’ụbọchị Tọzdee.

GUKWUO: ONYEISIALA EZIGARALA APC NA OYETOLA OZI EKELE MAKA MMERI HA NWETARA NA NTULIAKA

Adeleke kwuru nke a site n’ọnụ nwanne ya nwoke bụ Dele Adeleke. O kwuru na ha ga-ahụ ndị ndú PDP tupu ha agawala ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka.

Dele gakwara n’ihu kwuo na n’ikpeazụ uche ndị mmadụ ga-emejupụta.

1 ikwu

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here