NTỤLIAKA ELU 2019: SULTAN ARỊỌLA NDỊ NAỊJỊRỊA KA HA GBAARA ỌGBAGHARA NAKWA TIGBUO ZỌGBUO ỌSỌ

Sultan nke Sokoto bụ Alhaji Sa’ad Abubakar III, arịọla ndị ala anyị ka ha wepụ ọgbaghara nakwa tigbuo zọgbuo tụpụ nakwa mgbe a ga-eme ntuliaka elu n’afọ 2019.

Abubakar bụ onye Emir nke Keffi, Dr Shehu Chindo-Yamusa III nọchitere anya ya, kwuru nke a na Tụzdee n’Abuja n’ọgbakọ nke ndị Nigerian Interfaith Action Association (NIFAA) haziri iji kwalite udo nakwa idi n’otu n’etiti ndị ala anyị bụ Naịjịrịa. Isiokwu ọgbakọ ahụ bụ: “Promote and Sustain Peaceful Co-existence among Nigerians’’.

GUKWUO: AMERIKA GA-ANABATA MMADỤ DỊ PỤKỤ NARI ỊRỊ ATỌ NA PỤKỤ ỊRỊ GBARA ỌSỌ NDỤ N’OBODO AHỤ N’AFỌ 2019

O kwuru na ọ dịghị mma ndị ala anyị ịnọ na-alụrịta onwe ha ọgụ n’ihi ndọrọndọrọ ọchịchị.

N’okwu ya “E nweghị obodo maọbụ otu o bụla ga-enwe ọganịịhụ ma ewepu udo na idi n’otu.

Ya mere m ji arịọ ndị ala anyị ka ha biri n’udo n’agbanyeghị otu pati onye ọ bụla nọ n’ime ya.

A na m arịọ ndị ndụ ọdịnala nakwa ndị ndụ ụka ka ha na-agbasa ozi udo bụkwa nke ga-eme ka enwe udo n’ọganịịhụ na Naịjịria”.

 

 

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here