Nwata akwukwo nke Ulo akwukwo Gloryland international College Surulere, bu Nwaada Ifunanya Ezike nwetara akara kasi mma na ule nke eji apu n'ulo akwukwo secondary bu (West African Secondary School Examination-WASSE)na asusu bekee, nke afo puku abuo na iri na isii(2016) n'ime Lagos,
Spread the love
IFUNANYA NWATA AKWUKWO KACHA MEE OFUMA NA ULE NKE EJI APU N’ULO AKWUKWO SECONDARY(WASSCE) ENWETA IHE NRITA MAKA IME OFUMA YA.

Nwata akwukwo nke Ulo akwukwo Gloryland international College Surulere, bu Nwaada Ifunanya Ezike nwetara akara kasi mma na ule nke eji apu n’ulo akwukwo secondary bu (West African Secondary School Examination-WASSE)na asusu bekee, nke afo puku abuo na iri na isii(2016) n’ime Lagos, omere ofuma site na inweta akara kachi elu nke akporo (eight distinction) na asusu bekee, Onye isi ulo akwukwo ha bu Iche Sumbo Onitiri nyere ya ihe nrita nke ime ofuma n’ihi otu osi mee ulo akwukwo obi uto.

Di ka ha n’eme emume nke inye ihe nritaa bukwanu mgbe ha n’eme emume nke ije ozi ha nke afor puku abuo na iri na isii nakwa nke puku abuo na iri na asaa, Onye isi ulo akwukwo ha nke nwanyi bu Lolo Mobolaji Onitiri nyere Ezike otuto ruuru ya ma duokwa umu akwukwo ndi no na ngwucha ma na  akwado opupu ka ha mee nke oma karia ya.

Lolo Onitiri gakwara n’ihu ikwu na ebumnobi ndi hiwere ya bu ulo akwukwo bu ka oburu etiti ime ofuma nakwa ka oburu nke mbu na ala Naijiria Nile, okwuru na ya bu ulo akwukwo ji ndi nile ha zuputarala wee n’eme onu bu ndi gunyere ,Ndi Oka Ikpe, Ndi Dibia Bekee, Ndi Okacha Mara na Agumakwukwo,Ndi Olu Mmeputa, Ndi Okacha Mara n’igwe Komputa,na ndi ozo di iche iche, tinyerekwara ndi ji okwa di iche iche n’otu na achi isii nke ala anyi, otutu n’ime ha biakwara ya bu mmemme.

GWO NKA: MMADU ABUO NAMAGHI ORU WARA NWANYI AFO

Onye isi ulo akwukwo ahu kwukwara na malite na Agumakwukwo nke okara ozo ga ebido na onwa nke itolu (September) ha ebido kuziwere umuakwukwo ha ihe gbasara olu aka, ka oga abu ngwa ngwa ha putara n’ulo akwukwo ka ha bido wewa ndi mmadu n’olu, Owee na akpoku ndi achi obodo ka ha haziharia usoro Agumakwukwo nke ala anyi n’uzo ga ekwe ka umu akwukwo na agu ma na anwale ihe mmuta ha ,ka enwee ike ibelata onu ogugu nke ndi guchara akwukwo ma na enweghi olu obula, N’ekwukwa na odighi mma ka ana ele omumu ihe aka oru n’ime ulo akwukwo ka ihe na enweghi uru obara, Onye isi nwe ya bu ulo akwukwo bu Mazi Adebisi Onitiri kwuru na mgbaha adighi ya n’oge n’adighi anya umu akwukwo ha nile ga arigarucha na mbe nke ime ofuma ma werechaa onudu n’ebe kwesiri ha dika umu akwukwo ha ndi pugoronu, ndi no na ime nakwa na mpuga obodo Naijiria.

Onye isi nchikota ulo akwukwo ahu Nwaada Jumoke Adesanya gwar a umu akwukwo ha n’ugbua bu oge ha ga eji wee na arusi oru ike ka wee n’eme ofuma na Agumakwukwo ha ,ma ghara kwa ikwe ka ebe obibi ha nakwa ihe nsogbu ndi so ha buru odachi nyere ha n’ime ka nro ha Ibu ndi mere ofuma n’ndu ha laa n’ihi.

Kpoturum n’akara oha nto akukom maka akuko ndi ozo yiri ya ,
@Isimbidotv

GWO:

1 comment

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Isughari

ISI MBIDO UTUTU OMA NWAMGBOKWO OKOYE

K’ANYI KWURITA OKWU Twitter

Subscribe to Blog via Email

Join 125 other subscribers